Abụ Ọma 145

Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru.

Psalm 145:15 (UKJV) The eyes of all wait upon you; and you give them their food in due season.

13Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.

14Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba.

15Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru.

16I na-asaghepụ aka gị na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.

17Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi; ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.