10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma.
11Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị,
12ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị.
13Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
14Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba.