8Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko, ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, ọ bara ụba nʼịhụnanya.
9Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị; o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o kere eke dị.
10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma.
11Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị,
12ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị.