3Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta.
4Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ; ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.
5Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị, aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile.
6Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile, aga m ekwusakwa ọrụ ukwuu gị niile.
7Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu jirikwa ọṅụ bụọ abụ banyere ezi omume gị.