Abụ Ọma 22

Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.

Psalm 22:11 (UKJV) Be not far from me; for trouble is near; for there is none to help.

9Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.

10Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.

11Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.

12Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu.

13Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.