19Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya; gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.
20Napụta ndụ m site na mma agha, site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa.
21Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, zọpụta m site na mpi atụ ndị a.
22Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.
23Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!