21Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, zọpụta m site na mpi atụ ndị a.
22Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.
23Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!
24Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.
25Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.