27Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute Onyenwe anyị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya.
28Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị, ọ na-achịkwa mba niile.
29Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.
30Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi; a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.
31Ha ga-ekwusa ezi omume ya nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị nʼihi na o meela ya.