25Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.
26Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
27Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute Onyenwe anyị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya.
28Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị, ọ na-achịkwa mba niile.
29Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.