Abụ Ọma 22

Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel.

Psalm 22:3 (UKJV) But you are holy, O you that inhabit the praises of Israel.

1Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m? Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m, nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile?

2O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.

3Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel.

4Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.

5Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.