2O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.
3Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel.
4Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.
5Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.
6Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.