4Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.
5Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.
6Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.
7Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị.
8“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi; ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.”