1Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku; gị bụ Oke nkume m, agbala m nkịtị. Ọ bụrụ na ị jụ ịza m, aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu.
2Nụrụ arịrịọ m maka ebere dịka m na-akpọku gị maka enyemaka, mgbe m chịlịri aka m abụọ elu nʼEbe gị Kachasị Nsọ.
3Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ, tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe, ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo, ma ha bu iro nʼime obi ha.