Abụ Ọma 33

Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.

Psalm 33:1 (UKJV) Rejoice in the LORD, O all of you righteous: for praise is comely for the upright.

1Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.

2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.

3Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.