Abụ Ọma 33

Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu; ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.

Psalm 33:15 (UKJV) He fashions their hearts alike; he considers all their works.

13Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya. Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya.

14O sitere nʼebe obibi ya na-ele onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya.

15Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu; ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.

16Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya; o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya.

17Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha. Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.