Abụ Ọma 33

Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.

Psalm 33:4 (UKJV) For the word of the LORD is right; and all his works are done in truth.

2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.

3Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.

4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.

5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ.

6Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile, jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.