4Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.
5Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha.
6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile.
7Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha.
8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.