22O Onyenwe anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị; anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị.
23Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m. Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m.
24O Onyenwe anyị Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị; ekwekwala ka ha chịa m ọchị.
25Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!” Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!”
26Mee ka ihere na ọgbaaghara bụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m; were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe, bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m.