24O Onyenwe anyị Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị; ekwekwala ka ha chịa m ọchị.
25Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!” Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!”
26Mee ka ihere na ọgbaaghara bụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m; were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe, bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m.
27Ka ndị niile mkpepụta m dị mma were obi ụtọ tie mkpu ọṅụ; ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie Onyenwe anyị elu, onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.”
28Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.