Abụ Ọma 35

Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị; bịa zute ndị na-achụ m ọsọ. Gwa mkpụrụobi m, “Abụ m nzọpụta gị.”

Psalm 35:3 (UKJV) Draw out also the spear, and stop the way against them that persecute me: say unto my soul, I am your salvation.

1O Onyenwe anyị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ; buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha.

2Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị; bilie bịa nyere m aka.

3Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị; bịa zute ndị na-achụ m ọsọ. Gwa mkpụrụobi m, “Abụ m nzọpụta gị.”

4Mee ka ihere mee ndị niile na-agbalịsị ike igbu m. Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ, na ndị ihere mere.

5Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe, ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.