8Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.
9Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.
10Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha.
11Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.
12Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, na-ata ikekere eze megide ha;