10Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha.
11Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.
12Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, na-ata ikekere eze megide ha;
13ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị, nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa.
14Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, kwee ụta ha ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.