Abụ Ọma 37

Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;

Psalm 37:16 (UKJV) A little that a righteous man has is better than the riches of many wicked.

14Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, kwee ụta ha ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.

15Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha.

16Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;

17nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.

18Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.