Abụ Ọma 37

Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha.

Psalm 37:15 (UKJV) Their sword shall enter into their own heart, and their bows shall be broken.

13ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị, nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa.

14Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, kwee ụta ha ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.

15Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha.

16Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;

17nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.