36ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ, nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya.
37Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama; ọganihu dịịrị onye udo.
38Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi; ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume.
39Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa; ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.
40Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.