Abụ Ọma 38

Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.

Psalm 38:14 (UKJV) Thus I was as a man that hears not, and in whose mouth are no reproofs.

12Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya, ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m; ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ.

13Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.

14Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.

15O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.

16Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.