Abụ Ọma 38

O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.

Psalm 38:15 (UKJV) For in you, O LORD, do I hope: you will hear, O Lord my God.

13Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.

14Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.

15O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.

16Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”

17Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.