15O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.
16Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”
17Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.
18Ana m ekwupụta mmehie m; mmehie m na-ewute m.
19Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ, ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.