Abụ Ọma 38

Ana m ekwupụta mmehie m; mmehie m na-ewute m.

Psalm 38:18 (UKJV) For I will declare mine iniquity; I will be sorry for my sin.

16Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”

17Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.

18Ana m ekwupụta mmehie m; mmehie m na-ewute m.

19Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ, ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.

20Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe, na-ebo ebubo megide m nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.