4Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.
5Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi nʼihi mmehie enweghị uche m.
6Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.
7Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu ahụ adịghịkwa m.
8Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa. Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.