10I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga, i meela ka ndị na-emegide anyị were aka ike napụ anyị ihe bụ nke anyị.
11Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ, ma chụsasịa anyị nʼetiti mba niile.
12I rere ndị gị ọnụ ala, ihe i retara ha abaghị uru nye gị.
13I meela ka anyị bụrụ nkọcha nye ndị agbataobi anyị, anyị bụ ihe ịkwa emo na ihe ọchị nye ndị gbara anyị gburugburu.
14I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile, ndị ọbụla hụrụ anyị na-efufe isi na mkparị.