7ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ, ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị.
8Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile, anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. Sela
9Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala; ị naghị esokwa ndị agha anyị apụ ọzọ.
10I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga, i meela ka ndị na-emegide anyị were aka ike napụ anyị ihe bụ nke anyị.
11Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ, ma chụsasịa anyị nʼetiti mba niile.