3Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike; o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike.
4Mgbe ndị eze jikọtara ndị agha ha ọnụ, mgbe ha bịakọtara nso,
5ihe ha hụrụ juru ha anya; nʼihi oke egwu, ha gbara ọsọ.
6Ahụ ọma jijiji bidoro ha nʼebe ahụ, ihe mgbu ha dịka nke nwanyị na-achọ ịmụ nwa.
7Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ si ala ụgbọ mmiri ukwuu nke Tashish nʼiyi.