9Enweghị m mkpa maka oke ehi unu site nʼụlọ anụmanụ unu maọbụ mkpi site nʼọgba igwe ewu na atụrụ unu,
10nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m, ha na ehi niile nọ nʼelu otu puku ugwu.
11Amaara m ụmụ nnụnụ niile nọ nʼelu ugwu niile, ihe niile e kere eke nọ nʼọhịa bụ nke m.
12Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m agwa gị ya, nʼihi na ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke m.
13Ana m ata anụ oke ehi, ka ọ bụ ọbara mkpi ka m ga-aṅụ?