Abụ Ọma 50

nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m, ha na ehi niile nọ nʼelu otu puku ugwu.

Psalm 50:10 (UKJV) For every beast of the forest is mine, and the cattle upon a thousand hills.

8Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu, na aja nsure ọkụ unu nke na-adị m nʼihu oge niile.

9Enweghị m mkpa maka oke ehi unu site nʼụlọ anụmanụ unu maọbụ mkpi site nʼọgba igwe ewu na atụrụ unu,

10nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m, ha na ehi niile nọ nʼelu otu puku ugwu.

11Amaara m ụmụ nnụnụ niile nọ nʼelu ugwu niile, ihe niile e kere eke nọ nʼọhịa bụ nke m.

12Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m agwa gị ya, nʼihi na ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.