16Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu?
17Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị, na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu.
18Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka; unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke.
19Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ, okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi.
20Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.