Abụ Ọma 50

Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.

Psalm 50:20 (UKJV) You sit and speak against your brother; you slander yours own mother's son.

18Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka; unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke.

19Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ, okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi.

20Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.

21Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu.

22“Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke, ma ọ bụghị ya, aga m adọrisi unu, ọ dịkwaghị onye ga-agbapụta unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.