Abụ Ọma 50

Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu.

Psalm 50:21 (UKJV) These things have you done, and I kept silence; you thought that I was altogether such an one as yourself: but I will reprove you, and set them in order before yours eyes.

19Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ, okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi.

20Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.

21Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu.

22“Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke, ma ọ bụghị ya, aga m adọrisi unu, ọ dịkwaghị onye ga-agbapụta unu.

23Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m, ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.