1O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m, chebe m site nʼaka ndị na-ebili imegide m.
2Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe, zọpụtakwa m site nʼaka ndị ogbu mmadụ.
3Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ! Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m, o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m.