13Ọ bụladị mgbe ị na-arahụ ụra nʼetiti ọgba atụrụ, nku abụọ nke nduru m bụ ihe e ji ọlaọcha kpuchie, jirikwa ọlaedo nke na-enwuke kpuchie abụba ya.
14Mgbe Onye pụrụ ime ihe niile chụsasịrị ndị eze bi nʼala a, ọ dị ka snoo dara nʼelu Zalmon.
15Ugwu Bashan, ugwu mara mma nke ukwuu, ugwu Bashan, ugwu nwere nʼelu ya ọtụtụ ugwu dị iche iche.
16Gị ugwu nwere ọtụtụ ugwu, gịnị mere i ji ele anya site nʼekworo nʼugwu Chineke họọrọ ị bụ ebe ọ ga-anọ chịa, ebe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-ebi, ruo ebighị ebi?
17Ọnụọgụgụ ụgbọ agha Chineke dị iri puku kwụrụ puku, a pụghị ịgụta ha; ha dịkwa puku kwụrụ puku; Onyenwe anyị sitere Saịnaị bata nʼụlọnsọ ya.