1Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro ya site nʼihu ya gbalaga.
2Dịka ikuku si achụsa anwụrụ ọkụ, sikwa otu a chụsaa ha. Dịka mmanụ na-ehi ụra si agbaze nʼọkụ, ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa nʼiyi nʼihu Chineke.
3Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ, ma ṅụrịa nʼihu Chineke; ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ.
4Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto, toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya, Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.