24Wụkwasị ha oke iwe gị, ka iwe gị dị ọkụ zute ha.
25Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ụlọ ikwu ha.
26Ha na-akpagbu ndị ahụ i merụrụ ahụ, na-ekwukwa banyere ihe mgbu ndị ahụ i kwohịara ahụ.
27Boo ha ebubo ajọ omume tụkwasị nʼelu ajọ omume, ekwekwala ka ha keta oke na ezi omume gị.
28Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ, ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume.