1O Chineke, zọpụta m, nʼihi na mmiri abịaruola m nʼolu.
2Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi, e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị. Abịala m nʼebe mmiri dị omimi; uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m.
3Akpịrị akpọọla m nkụ; ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka. Anya m agbaala ọchịchịrị ebe m na-ele anya Chineke.
4Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu karịa agịrị isi dị m nʼisi. Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu, bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha. Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi ihe m na-ezughị nʼohi.
5Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile; ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị.