6Ekwela ka ihere mee ndị na-atụkwasị gị obi nʼihi m, O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; ka ndị na-achọ gị ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m, O Chineke nke Izrel.
7Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo, ihere ekpuchiela m ihu.
8Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ, nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.
9Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi, ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m.
10Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ, ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a.