4Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu karịa agịrị isi dị m nʼisi. Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu, bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha. Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi ihe m na-ezughị nʼohi.
5Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile; ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị.
6Ekwela ka ihere mee ndị na-atụkwasị gị obi nʼihi m, O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; ka ndị na-achọ gị ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m, O Chineke nke Izrel.
7Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo, ihere ekpuchiela m ihu.
8Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ, nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.