5Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide, dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.
6Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ, dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.
7Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa; ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa.
8Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri, na-esite nʼiyi ukwu. ruo na nsọtụ niile nke ụwa
9Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya, ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala.