9Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.
10O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi?
11Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!
12Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa.
13Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.