11Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!
12Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa.
13Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.
14Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan, mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara.
15Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ. I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa.