11Ha chefuru ihe o mere, ọrụ ịtụnanya o gosiri ha.
12Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha nʼala Ijipt na nʼọhịa Zoan.
13O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha. O mere ka mmiri ahụ guzo ọtọ dịka mgbidi.
14O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie, jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile.
15Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara, si otu a nye ha mmiri hiri nne, dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri si nʼọtụtụ oke osimiri.