9Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha, chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha.
10Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke. Ha jụkwara ibi ndụ dịka iwu ya si dị.
11Ha chefuru ihe o mere, ọrụ ịtụnanya o gosiri ha.
12Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha nʼala Ijipt na nʼọhịa Zoan.
13O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha. O mere ka mmiri ahụ guzo ọtọ dịka mgbidi.